IGBO – Nigeria - EKPERE NKE OBI IHUNANYA
IGBO – Nigeria
Jesu! Mary! A huru m Gi n’anya.
Biko ndo! Zoputa mkpuru obi nile.
Amen.
O! Obi Ihunanya!
O! Obi Jikororii onu n’ihunanya!
Mee m ka m na ahu Gi n’anya oge nile.
Ma nyere m aka kam mee ka ndi ozo na-ahu Gi n’anya.
Were obi m dara ogbenye na njo N’onwe
Gi, enyeghachila m ya azu ruo mgbe o tughariri
buru oku n’enwu-enwu nke ihunanya Gi.
A ma m na etosighi m ibiakwute Gi n’onwe m, ma
were m n’onwe Gi, jiri ire oku nke ihunanya Gi
reechaa m ka m di ocha. Were m n’onwe Gi, jiri m
mee otu o siri so Gi n’ihi na a bucha m nke Gi.
Amen.
O! Ihunanya di Ocha!
O! Ihunanya di Aso!
Jiri ube Gi mapuo m ma mee ka obara m
na-agbabanye n’ime onya nke Obi N’eburo njo.
O! Obi N’Eburo njo!
Jikonye n’Obi di Aso, ka I nye ndu, tasie obi,
nye otito na ihunanya.
Amen.
O! Jesu! O! Mary!
I bu Obi Ihunanya!
A huru m Gi n’anya. Richaa m!
A bu m ihe aja ihunanya Gi.
Amen.
O! Obi Ihunanya!
Richaa m!
A bu m ihe aja ihunanya Gi.
Amen.
Approval:
Owerri (Nigeria), 15 Nov. 1987 Vicarius Generalis, Msgr. V.A. Chikwe